Isaiah 48

Izrel Onye isiike

1“Geenụ ntị na nke a, unu agbụrụ Jekọb,
unu ndị a na-akpọ nʼaha Izrel,
ndị si nʼagbụrụ Juda pụta.
Unu ndị na-eji aha Onyenwe anyị na-aṅụ iyi,
ndị na-akpọku aha Chineke nke Izrel,
ma ọ bụghị nʼeziokwu maọbụ nʼezi omume.
2Unu ndị na-akpa nganga na unu bụ ndị bi nʼobodo dị nsọ,
ndị na-anyakwa isi na unu na-adabere na Chineke Izrel.
Onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
3Nʼoge gara aga ka m kwuru ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu.
Mgbe m kwupụrụ ya,
emekwara m ka ihe ahụ m kwuru mezuo.
4Nʼihi na amaara m na unu bụ ndị isiike,
matakwa na akwara dị unu nʼolu bụ igwe a na-apụghị ịrọji arọji.
Amakwaara m na egedege ihu unu bụ bronz.
5Ọ bụ ya mere m ji buru ụzọ gwa unu nʼoge gara aga
ihe m gaje ime,
ka unu ghara ị sị,
‘Ọ bụ arụsị anyị mere ya.
Ọ bụ arụsị anyị a pịrị apị na chi ọla m nyere iwu ka ha mee!’
6Unu anụla ama m na-agba, hụkwa ka ha na-emezu,
ma unu ajụla ikwere na ọ bụ eziokwu.

“Site ugbu a gawa, aga m agwa unu ihe ọhụrụ
nke m na-agwabeghị unu na mbụ.
7Ọ bụ ugbu a ka e kere ya, ọ bụghị na mgbe ochie.
Unu anụtụbeghị ihe banyere ya mbụ,
ya mere, unu agaghị asị,
‘Ọ bụ ihe maara ihe banyere ya.’
8E, ị nụbeghị, ị maghịkwa,
site na mgbe ochie ntị gị egheghị oghe.
Nʼihi na amaara m na ị bụ onye aghụghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi,
onye a na-akpọ onye nnupu isi site nʼafọ nne ya.
9Ma nʼihi aha m, ka m na-eme ka ọnụma m jụrụ
nʼihi otuto m, a na m egbochi ya nʼebe ị nọ,
ka a ghara ikpochapụ unu kpamkpam.
10Lee, anụchaalam unu, ma ọ bụghị dịka e si anụcha ọlaọcha nʼọkụ.
E, anwaleela m unu nʼoke ọkụ nke ahụhụ.
11Nʼihi mụ onwe m, e, nʼihi mụ onwe m, ka m na-eme nke a.
Aga m esi aṅaa hapụ ka m bụrụ onye emere ka aha m ghara ịdị nsọ?
Agaghị m enye onye ọzọ otuto m.

Izrel enwere onwe ya

12“Geenụ m ntị, gị Jekọb,
na gị Izrel onye m kpọrọ.
Mụ onwe m bụ onye ahụ;
Abụ m onye mbụ, bụrụkwa onye ikpeazụ.
13Ọ bụ aka m tọrọ ntọala ụwa.
Ọ bụkwa aka nri m gbasara eluigwe.
Mgbe m kpọrọ ha oku
ha na-abịa guzo nʼihu m.

14“Chịkọtaanụ onwe unu, unu niile, geenụ ntị.
Onye nʼetiti arụsị ndị a gosiri ihe ndị a na-aga ime?
Onye ahụ Onyenwe anyị họọrọ ka ya na ya dị na mma
ga-emezu nzube ya megide Babilọn,
aka ya ga-emegide ndị Kaldịa.
15Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m ekwuola ya;
e, akpọọla m ya.
Aga m eme ka ọbịa
nʼije ya, ọ ga-agakwa nke ọma.
16“Bịakwutenụ m nso, geenụ ntị na nke a:

“Site na mkpọsa mbụ ọ bụghị na nzuzo ka m kwuru okwu;
mgbe o mere anọ m nʼebe ahụ.”

Ma ugbu a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ezitela m,
o mejupụtala m na Mmụọ ya.

17Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
Onye mgbapụta unu, bụ Onye nsọ Izrel,
“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
onye na-ezi unu ihe nʼihi ọdịmma unu,
na-eduzikwa unu nʼụzọ unu kwesiri iso.
18A sịkwarị na unu ṅara ntị nʼiwu m niile,
udo unu gaara na-eru dịka osimiri,
ọdịmma
Maọbụ, ezi omume
unu adịkwa ka mmali nke ebili oke osimiri.
19Mkpụrụ gị gaara amụba dịka aja,
ụmụ unu gaara a dị ka mkpụrụ ọkụkụ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ,
a gaghị ehichapụkwa aha ha,
maọbụ bibie nʼihu ha.”

20Sitenụ na Babilọn pụọ,
gbanarịnụ ndị Kaldịa!
Werenụ olu iti mkpu ọṅụ
kwusaa inwere onwe unu a.
Meenụ ka ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa nụrụ ya
sịnụ, “Onyenwe anyị agbapụtala ohu ya Jekọb.”
21Mgbe O duuru ndị ya jee ije nʼọzara, ala kpọrọ nkụ, akpịrị akpọghị ha nkụ.
O mere ka mmiri si nʼoke nkume sọpụtara ha,
e, ọ kpọwara oke nkume
mee ka mmiri sọpụta.

22 Onyenwe anyị sịrị, “Ọ dịghị udo dịrị ndị na-emebi iwu.”
Copyright information for IboBIU